Isaiah 46

Chi dị iche iche nke ndị Babilọn

1Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu.
Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu.
Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ,
ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!
2Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu;
ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha,
ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.

3“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,
unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,
unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ unu
na-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.
4Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,
ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.
Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.
Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.

5“Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha?
Onye ka unu ga-eji tụnyere m?
6Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya,
na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ,
were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi,
emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.
7Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha,
buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ.
Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa.
Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza,
ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.

8“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya,
ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.
9Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga,
nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa.
Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.
10Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite,
ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu.
Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide.
Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’
11Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe,
e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke
Sairọs, ka a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a.
ahụ ga-abịa mee nzube m.
Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo;
ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.
12Geenụ m ntị, unu ndị isi ike,
unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.
13Ana m eweta ezi omume nso,
ọ dịghị nʼebe dị anya,
nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ.
Aga m enye Zayọn nzọpụta,
nyekwa Izrel ịma mma m.
Copyright information for IboBIU